6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele,+ ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ N’ihi na mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa, mmiri iyi ga na-agbapụtakwa na mbara ọzara.
18 M ga-eme ka osimiri si n’elu ugwu nke ọhịa na-adịghị na-agbapụta, meekwa ka isi iyi si na ndagwurugwu* na-agbapụta.+ M ga-eme ka ala ịkpa ghọọ ọdọ mmiri nke ahịhịa amị jupụtara, meekwa ka ala mmiri na-adịghị ghọọ isi mmiri.+
11 Jehova ga na-edu+ gị mgbe niile,+ na-enyejukwa mkpụrụ obi gị afọ ọbụna n’ala kpọrọ nkụ,+ ọ ga-emekwa ka ọkpụkpụ gị dị ike;+ ị ga-adịzi ka ubi nke mmiri na-ede nke ọma,+ dịkwa ka isi mmiri, nke mmiri ya na-adịghị ata ata.