11 N’oge ahụ, a ga-agwa ndị a, gwakwa Jeruselem, sị: “E nwere ifufe na-ekpo ọkụ nke si n’ụzọ ndị e ji ụkwụ waa n’ala ịkpa+ fere na-aga n’ebe ada bụ́ ndị m nọ;+ ọ bụghị maka ịfụcha ihe, ọ bụghịkwa maka ime ka ihe dị ọcha.
13 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-eji ọnụma m mee ka oké ifufe fee, n’iwe m ka oké mmiri ozuzo ga-ezo, n’ọnụma m ka akụ́ mmiri ígwé ga-ada iji weta mkpochapụ.+