11 Ndị Izrel niile emebiwokwa iwu gị, ha ahapụwo gị site n’ịjụ irube isi n’ihe i kwuru,+ i wee mee ka ọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi nke e dere n’iwu Mozis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ n’ihi na anyị emehiewo Ya.
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+