18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi ahụ, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ nakwa ka ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha mara jijiji ma guzoro n’ebe dịtụ anya.+
11 Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu+ na ike+ na ịma mma+ na ebube+ na nsọpụrụ;+ n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile,+ ọ bụ gị nwe alaeze.+