48Nụrụnụ ihe a, ụlọ Jekọb, unu ndị na-aza aha Izrel,+ ndị sikwa na mmiri Juda pụta,+ unu ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+ ndị na-akpọ aha Chineke Izrel,+ ma ọ bụghị n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume.+
10 n’agbanyeghị ihe a dum, nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ bụ́ Juda ejighị obi ya dum lọghachikwute m,+ kama o ji aghụghọ lọghachikwute m,’+ ka Jehova kwuru.”
6 Ọ sịrị ha: “Aịzaya buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, unu ndị ihu abụọ, dị ka e dere,+ sị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ.+