4 Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile+ n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ,+ iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.+ Ihe mbụ niile agabigawo.”+
2 na-asọda n’etiti mbara okporo ámá ya. E nwere osisi+ nke ndụ n’otu akụkụ nke osimiri ahụ nakwa n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha na-amị mkpụrụ ugboro iri na abụọ n’afọ, ha na-amị mkpụrụ ha kwa ọnwa.+ Akwụkwọ nke osisi ndị ahụ bụ maka ịgwọ mba niile.+