7 “M ga-edebe ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti mụ na gị+ na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ruo mgbe a na-akaghị aka,+ ka m wee gosi na m bụ Chineke gị nakwa Chineke nke mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị.+
11 Chineke wee gwakwa ya, sị: “Abụ m Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Mba dị iche iche na ìgwè mba dị iche iche ga-esikwa na gị pụta, ndị eze ga-esikwa n’úkwù gị pụta.+