4 Atụla egwu,+ n’ihi na a gaghị emenye gị ihere;+ ihere emela gị, n’ihi na a gaghị emechu gị ihu.+ N’ihi na ị ga-echefu ọbụna ihere mere gị mgbe ị bụ nwata,+ ị gaghịkwa echeta nkọcha a kọchara gị n’oge niile ị nọrọ dị ka nwaanyị di ya nwụrụ.”
11 N’ụbọchị ahụ, ihere agaghị eme gị n’ihi mmehie niile i mere megide m,+ n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-ewepụ ndị gị dị mpako n’etiti gị;+ ị gakwaghị adị mpako n’ugwu nsọ m.+