11 Mgbe ntakịrị alaka ya kpọnwụrụ, ndị inyom na-abata ga-anyakapụ ha, mụnyekwa ha ọkụ.+ N’ihi na ha abụghị ndị dị nkọ n’ịghọta ihe.+ N’ihi ya, Onye kere ha agaghị emere ha ebere, Onye kpụrụ ha agaghịkwa emere ha amara.+
7 Ọbụna ụgbala nke na-efe n’eluigwe maara oge ya a kara aka;+ nduru+ na elekentịọba na nnụnụ bulbul—nke ọ bụla n’ime ha maara nke ọma oge o ji alọta. Ma ndị m amaghị mkpebi ikpe Jehova.”’+
6 Ndị m ga-ala n’iyi, n’ihi na ihe ọmụma adịghị.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo ihe ọmụma,+ mụ onwe m ga-ajụ gị ka ị ghara ịbụkwa onye nchụàjà m;+ ebe ọ bụ na ị na-echefu iwu Chineke gị,+ mụ onwe m ga-echefu ụmụ gị.+
44 Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala,+ ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya+ n’ime gị, n’ihi na ị ghọtaghị oge e ji eleta gị.”+