25 N’oge ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.+
10 Ọ̀ bụ na i kweghị na mụ na Nna m dị n’otu, na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu?+ Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m; kama ọ bụ Nna m nke mụ na ya dị n’otu na-arụ ọrụ ya.+