34 Ònye bụ onye ahụ nke ga-ama ha ikpe? Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụ, ee, kama ọ bụ onye e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, onye nọ n’aka nri+ nke Chineke, onye na-arịọkwara anyị arịrịọ.+
25 N’ihi ya, o nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.+
26 Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ọ ga na-ata ahụhụ mgbe mgbe malite mgbe a tọrọ ntọala+ ụwa. Ma ugbu a, o mewo onwe ya ka ọ pụta ìhè+ naanị otu ugboro+ n’ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a+ iji wepụ mmehie site n’ịchụ onwe ya n’àjà.+
2Ụmụntakịrị m, m na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie.+ Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka,+ onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.+