11 “N’ihi na m nọnyeere gị,” ka Jehova kwuru, “ịzọpụta gị;+ ma m ga-ekpochapụ mba niile m chụgara gị.+ Otú ọ dị, agaghị m ekpochapụ gị.+ M ga-agbazi gị ruo n’ókè kwesịrị ekwesị, n’ihi na agaghị m ahapụ inye gị ntaramahụhụ.”+
22 N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla; ma n’ihi ndị a họọrọ,+ a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.+