48 Ị ga na-ejere ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova ga-ezite ibuso gị agha, ozi.+ Agụụ ga na-agụ gị,+ akpịrị ga na-akpọ gị nkụ, ị ga-agbakwa ọtọ ma nọrọ n’ụkọ ihe niile mgbe ị na-ejere ha ozi; ọ ga-anyawakwa gị yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara gị n’iyi.+
8 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “na m ga-agbaji yok ahụ ha nya n’olu, m ga-adọbikwa agbụ ha ụzọ abụọ,+ ndị ala ọzọ agakwaghị erigbu ha dị ka ohu.
27 Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ,+ ala ha ga-emepụtakwa ihe nke ọma,+ ha ga-anọkwa n’ala ha n’obi iru ala.+ Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha wee napụta ha n’aka ndị ji ha na-agba ohu.+