10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
14M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ+ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ,+ bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha.