26 “‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha nakwa n’aka Nebukadreza eze Babịlọn+ nakwa n’aka ndị na-ejere ya ozi; e mesịa, a ga-ebirighachi n’Ijipt dị ka ọ dị n’oge ochie,’+ ka Jehova kwuru.
19 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt,+ ọ ga-eburu akụ̀ ya, meekwa ka ọ bụrụ ihe nkwata buru ibu,+ bukọrọkwa ihe dị ukwuu na ya; ọ ga-aghọkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.’