14 ‘M ga-abọ ọbọ n’ahụ́ Idọm site n’aka ndị m Izrel;+ ha ga-eme Idọm dị ka iwe m na ọnụma m si dị; ha ga-amarakwa ihe ịbọ ọbọ m bụ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”’
19 Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ,+ kama nyenụ ọnụma ahụ ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.”+