4 n’ihi ụbọchị nke na-abịa bụ́ nke a ga-ebibi ndị Filistia niile,+ bụ́ ụbọchị a ga-ebipụ onye ọ bụla fọdụrụ nke na-enyere Taya+ na Saịdọn+ aka.+ N’ihi na Jehova ga-ebibi ndị Filistia,+ bụ́ ndị fọdụrụ n’ime ndị si n’agwaetiti Kaftọ.+
3 ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-emegide gị, Taya, m ga-akpọtakwa ọtụtụ mba ka ha buso gị agha,+ dị nnọọ ka a na-enwe ebili mmiri n’oké osimiri.+
4 “Oleekwa ihe jikọrọ mụ na unu, Taya na Saịdọn+ na unu ógbè niile nke Filistia?+ Ọ̀ bụ mmeso a ka unu ji na-akwụ m ụgwọ? Ọ bụrụkwa otú a ka unu na-emeso m, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+
9 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Taya nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ọ kpọọrọ ìgwè ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Idọm nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+