20 “Jehova ga-eme ka ọbụbụ ọnụ,+ ọgba aghara+ na ịba mba+ dakwasị gị n’ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị na-agbalị ime, ruo mgbe e kpochapụrụ gị, i wee laa n’iyi ọsọ ọsọ, n’ihi omume ọjọọ gị, ebe ọ bụ na ị hapụwo m.+
17 n’ihi na ha ahapụwo m wee gaa na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ka ha wee jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ+ kpasuo m iwe, e mewokwa ka ọnụma m nwuru ọkụ megide ebe a, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’”’+
11 “Ma unu bụ ndị na-ahapụ Jehova,+ ndị na-echefu ugwu nsọ m,+ ndị na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma,+ ndị na-agbajuru chi Akara Aka mmanya a gwara agwa.+
13 ‘n’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ: Ha ahapụwo mụ onwe m,+ bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,+ ka ha wee gwuoro onwe ha olulu, olulu gbawara agbawa, ndị na-apụghị ichedo mmiri.’
13 Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+