Levitikọs 26:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 M ga-eche ihu m megide unu, ndị iro unu ga-emeri unu;+ ndị kpọrọ unu asị ga-azọ unu ụkwụ,+ unu ga-agbakwa ọsọ mgbe ọ na-adịghị onye na-achụ unu.+ Abụ Ọma 34:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,+Iji mee ka a ghara ịkpọtụ ha aha n’ụwa.+ Jeremaya 44:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eche ihu n’ebe unu nọ iwetara unu ọdachi na ibipụ Juda dum.+ Ezikiel 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Echewo m ihu megide ha.+ N’ọkụ ka ha si pụta, ma ọkụ ahụ ga-erepịa ha.+ Unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova, mgbe m ga-eche ihu ime ha ihe.’”+ Emọs 9:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọ bụrụ na ndị iro ha adọrọ ha n’agha, m ga-enye mma agha iwu ka o gbuo ha n’ebe ahụ;+ m ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+ 1 Pita 3:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 N’ihi na anya+ Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike;+ ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”+
17 M ga-eche ihu m megide unu, ndị iro unu ga-emeri unu;+ ndị kpọrọ unu asị ga-azọ unu ụkwụ,+ unu ga-agbakwa ọsọ mgbe ọ na-adịghị onye na-achụ unu.+
11 “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eche ihu n’ebe unu nọ iwetara unu ọdachi na ibipụ Juda dum.+
7 Echewo m ihu megide ha.+ N’ọkụ ka ha si pụta, ma ọkụ ahụ ga-erepịa ha.+ Unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova, mgbe m ga-eche ihu ime ha ihe.’”+
4 Ọ bụrụ na ndị iro ha adọrọ ha n’agha, m ga-enye mma agha iwu ka o gbuo ha n’ebe ahụ;+ m ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+
12 N’ihi na anya+ Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike;+ ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”+