13 M ga-eme ka ọ zaa ajụjụ+ maka ụbọchị niile ọ nọ na-esurere ihe oyiyi Bel+ ihe nsure ọkụ,+ mgbe o ji ọla ntị ya na ihe ịchọ mma ya na-achọ onwe ya mma,+ na-agakwurukwa ndị ya na ha na-eme enyi,+ ma, ọ bụ m ka o chefuru,’+ ka Jehova kwuru.
4 Onye kasị mma n’ime ha yiri ahịhịa ogwu, onye kasị bụrụ onye ziri ezi n’ime ha dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.+ Ụbọchị ndị nche gị, mgbe a ga-elebara gị anya, ga-abịa.+ Ugbu a ka ha ga-anọ ná mgbagwoju anya.+