9 Ọ bụ ya mere m ga-eji kwaara osisi vaịn nke Sibma+ ákwá otú m na-akwara Jeza. M ga-eji anya mmiri m dee unu, Heshbọn+ na Iliele,+ n’ihi na e tiwo mkpu n’ọkọchị gị nakwa n’oge owuwe ihe ubi gị.+
33 E wepụwo obi ụtọ na ọṅụ n’ubi mkpụrụ osisi nakwa n’ala Moab.+ Emewokwa m ka mmanya ghara ịdị n’ebe nzọchapụta mmanya.+ O nweghị onye ga-eji iti mkpu ọṅụ na-azọcha mkpụrụ. Mkpu a ga na-eti agaghị abụ mkpu ọṅụ.’”+