8 Ya mere, o dere akwụkwọ ozi+ n’aha Ehab ma were akara eze kaa ha,+ ma zigara ndị okenye+ na ndị a ma ama nọ n’obodo ya, bụ́ ndị ha na Nebọt bi, akwụkwọ ozi ndị ahụ.
17 O dekwara akwụkwọ ozi+ iji kọchaa Jehova bụ́ Chineke Izrel+ na iji kparịa ya, sị: “Dị ka chi dị iche iche+ nke mba ndị dị n’ala ndị ahụ na-anapụtaghị ndị ha n’aka m,+ otú ahụ ka Chineke Hezekaya na-agaghị anapụta ndị ya n’aka m.”