6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+
10 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-elebara unu anya mgbe afọ iri asaa zuru na Babịlọn,+ m ga-eme ka okwu dị mma m kwuru mezuo n’isi unu site n’ịkpọlata unu ebe a.’+