6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele,+ ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ N’ihi na mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa, mmiri iyi ga na-agbapụtakwa na mbara ọzara.
16 M ga-eme ka ndị ìsì jee ije n’ụzọ ha na-amaghị;+ m ga-emekwa ka ha jee ije n’okporo ụzọ ha na-amaghị.+ M ga-eme ka ebe gbara ọchịchịrị n’ihu ha ghọọ ìhè,+ meekwa ka ala dị mkputamkpu ghọọ ala dị larịị.+ Ọ bụ ihe ndị a ka m ga-emere ha. M gaghịkwa ahapụ ha.”+