11 Onye si n’ahụ́ Jeroboam nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ya;+ onye nke nwụrụ n’ọhịa, anụ ufe nke eluigwe ga-eri ya,+ n’ihi na Jehova n’onwe ya ekwuwo ya.”’
4 ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị,+ a gaghịkwa eli ha eli.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala;+ mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi,+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.’+
7 M ga-emekwa ka atụmatụ Juda na Jeruselem bụrụ ihe efu n’ebe a,+ m ga-eme ka ndị iro ha jiri mma agha gbuo ha, meekwa ka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha gbuo ha.+ M ga-ewere ozu ha nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ka ha rie.+