15 Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya+ ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro, n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko,+ nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.+
13 Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+
3 “Malite n’afọ nke iri na atọ nke ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda, ruo taa, afọ iri abụọ na atọ a, okwu Jehova anọwo na-eru m ntị, m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ekwu okwu, ma unu egeghị ntị.+