26 “Otú ọ dị, ha ghọrọ ndị nnupụisi+ wee meere gị isi ike+ ma na-eleghara iwu gị anya,+ ha gbukwara ndị amụma gị,+ bụ́ ndị gbara àmà megide ha iji mee ka ha laghachikwute gị;+ ha wee na-eme omume nlelị dị ukwuu.+
30 Ma ị nọ na-emere ha ebere ruo ọtụtụ afọ,+ jirikwa mmụọ gị na-agba àmà+ megide ha site n’ọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị.+ N’ikpeazụ, i nyefere ha n’aka ndị ala ahụ.+
24 Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama ha jere ije dị ka atụmatụ ha si dị, dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ha si dị,+ nke mere ha ji na-ala azụ kama ịga ihu,+