26 Onye na-eme ka okwu ohu ya mezuo, Onye na-emezucha atụmatụ nke ndị ozi ya;+ Onye na-ekwu banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ebi na ya,’+ kwuokwa banyere obodo ndị dị na Juda, sị, ‘A ga-ewughachi ha,+ m ga-ewu ebe ya niile tọgbọrọ n’efu’;+
6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+