8 N’ọnwa nke ise, n’abalị asaa n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke iri na itoolu+ nke ọchịchị Eze Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche, bụ́ onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara na Jeruselem.+
17 O wee mee ka eze ndị Kaldia buso ha agha,+ eze ahụ wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ime ụlọ nsọ ha,+ o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko.+ O nyefere ihe niile n’aka ya.