5 N’ihi na ha na-achịrị anụ ụlọ ha, burukwa ụlọikwuu ha gbagote. Ha na-abịa n’ìgwè dị ka igurube,+ ha na kamel ha enweghị ngụta;+ ha na-abatakwa n’ala ahụ iji bibie ya.+
12 Ndị Midian na ndị Amalek na ndị niile si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube;+ kamel ha+ enweghị ngụta, ha dị ọtụtụ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.
17 Ndị nche gị dị ka igurube, ndị gị bụ́ ndị na-ewe ndị na-eje agha n’ọrụ dị ka ìgwè igurube. N’ụbọchị oyi, ha na-anọ n’ogige e ji nkume gbaa. Anyanwụ chawa, ha agbalaga; a gaghịkwa ama ebe ha gbagara.+