11 Mgbe ntakịrị alaka ya kpọnwụrụ, ndị inyom na-abata ga-anyakapụ ha, mụnyekwa ha ọkụ.+ N’ihi na ha abụghị ndị dị nkọ n’ịghọta ihe.+ N’ihi ya, Onye kere ha agaghị emere ha ebere, Onye kpụrụ ha agaghịkwa emere ha amara.+
6 Ndị m ga-ala n’iyi, n’ihi na ihe ọmụma adịghị.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo ihe ọmụma,+ mụ onwe m ga-ajụ gị ka ị ghara ịbụkwa onye nchụàjà m;+ ebe ọ bụ na ị na-echefu iwu Chineke gị,+ mụ onwe m ga-echefu ụmụ gị.+