9 Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ha bụ́ onye kpọpụtara ndị nna nna ha n’ala Ijipt,+ ha wee soro chi ọzọ+ dị iche iche wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka ọdachi a dum dakwasị ha.’”+
10 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ị gwa ndị a okwu a niile, ma ha asị gị, ‘Gịnị mere Jehova ji kwuo na oké ọdachi a dum ga-adakwasị anyị, olee otú anyị si jehie, oleekwa mmehie anyị mere Jehova Chineke anyị?’+