6 N’ihi na ọbụna ụmụnne gị na ezinụlọ nna gị, ee, ha onwe ha ghọrọ gị aghụghọ.+ Ọbụna ha onwe ha ji oké olu tie mkpu n’azụ gị. Atụkwasịla ha obi naanị n’ihi na ha na-agwa gị okwu ọma.+
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+