33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
64 “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+
8 “Biko, cheta+ okwu i nyere Mozis ohu gị n’iwu, sị, ‘Ọ bụrụ na unu onwe unu emee omume ekwesịghị ntụkwasị obi, mụ onwe m kwa ga-achụsasị unu n’etiti ndị dị iche iche.+
14 ‘M wee fesasịa ha dị ka oké ifufe ná mba niile+ ha na-amaghị;+ ala ha wee tọgbọrọ n’efu mgbe ha pụsịrị, n’enweghị onye si na ya na-agafe; n’enweghịkwa onye na-alọghachi n’ime ya,+ ha wee mee ka ala ahụ mara mma+ ghọọ ihe ijuanya.’”