17 ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Lee, m ga-ezigara ha mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe,+ m ga-emekwa ka ha dị ka mkpụrụ osisi fig gbawara agbawa nke a na-apụghị iri eri n’ihi otú o si mebie emebi.”’+
2 Ị ga-agba otu ụzọ n’ụzọ atọ ọkụ n’etiti obodo ozugbo ụbọchị niile nke nnọchibido ahụ zuru.+ Ị ga-achịrịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ ọzọ. Ị ga na-egbu ya mma agha gbaa obodo ahụ gburugburu,+ ị ga-aghasasịkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ikpeazụ ka ikuku buru ya, m ga-amịrịkwa mma agha chụwa ha.+