13 M ga-esi n’ala a tụga unu n’ala unu na-amaghị,+ nke nna unu hà na-amaghịkwa,+ n’ebe ahụ ka unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche+ ehihie na abalị, n’ihi na agaghị m emere unu amara.”’
4 I ji aka gị gbahapụ ihe nketa gị, nke m nyere gị.+ M ga-emekwa ka i jeere ndị iro gị ozi n’ala ị na-amaghị;+ n’ihi na iwe m amụnyewo unu ọkụ.+ Ọ ga na-erekwa ruo mgbe a na-akaghị aka.”