2 “Gwanụ Jeruselem okwu ga-eru ya n’obi.+ Tienụ mkpu gwa ya na oge ahụhụ ya agafewo,+ na a kwụchaala ụgwọ njehie ya.+ N’ihi na ọ natawo ụgwọ zuru ezu n’aka Jehova maka mmehie ya niile.”+
18 Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+ ma ekwela ka ihere mee m.+ Ka ọ bụrụ ha ka ụjọ ga-ejide, ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka ụbọchị ọdachi bịakwasị ha,+ mee ka ọkpụkpụ ha gbajisịa ọbụna okpukpu abụọ.+