5 M ga-ajụkwa ajụjụ ọbara unu bụ́ mkpụrụ obi unu. M ga-ajụta ya n’aka ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ; m ga-ajụtakwa mkpụrụ obi mmadụ+ n’aka mmadụ, n’aka onye ọ bụla nke bụ́ nwanne ya.
8 Mgbe m sịrị onye ajọ omume, ‘Gị onye ajọ omume, ị ghaghị ịnwụ!’+ ma i kwughị okwu iji dọọ onye ajọ omume ahụ aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ya,+ ya onwe ya ga-anwụ ná njehie ya dị ka onye ajọ omume,+ ma n’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya.