3 N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+
12 Ọ bụ n’ihi gị ka ndị mmadụ ga-ewu ebe ndị ahụ tọgbọrọ n’efu kemgbe oge dị anya gara aga;+ ị ga-ewughachikwa ọbụna ntọala ndị tọgbọrọ n’efu kemgbe ọtụtụ ọgbọ.+ A ga-akpọkwa gị onye na-arụzi ebe e tidara etida ná mgbidi,+ onye na-arụzi okporo ụzọ nke mmadụ si ala n’ụlọ ya.
4 Ha ga-ewughachi ebe e bibiri ebibi ndị dịwara kemgbe ogologo oge;+ ha ga-ewu ọbụna ebe ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu n’oge ochie.+ Ha ga-eme ka obodo ndị e bibiri ebibi dị ọhụrụ,+ bụ́ obodo ndị tọgbọrọ n’efu malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+