3 Ihe owuwu ụzọ mbata*+ nke dị n’ihu ụlọ nsọ nke ụlọ ahụ dị kubit iri abụọ n’ogologo, n’ihu ebe obosara nke ụlọ ahụ. Uhiè ya dị kubit iri, n’ihu ụlọ ahụ.
4 Ihe owuwu ụzọ mbata*+ nke dị n’ihu ụlọ ahụ dị kubit iri abụọ n’ogologo, n’ihu ebe obosara ụlọ ahụ, ọ dịkwa otu narị kubit na iri abụọ n’ịdị elu. O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya n’ime.