10 “‘Ma ndị Livaị ga-eji isi ha buru njehie ha.+ Ọ bụ ha hapụrụ m+ gaa n’ebe dị anya mgbe Izrel, ndị si n’ebe m nọ kpafuo, nọ na-eso arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị.
11 Ọ ga-abụ nke ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Zedọk+ ndị e doro nsọ, ndị nọ na-arụrụ m ọrụ, ndị na-akpafughị mgbe ụmụ Izrel kpafuru, dị nnọọ ka ndị Livaị kpafuru.+