13 Ọ ga-ahụ gị n’anya ma gọzie+ gị, meekwa ka ị mụbaa,+ ọ ga-agọzikwa mkpụrụ nke afọ+ gị na mkpụrụ nke ala+ gị, ọka* gị na mmanya ọhụrụ gị na mmanụ gị, obere ụmụ ehi gị na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ gị,+ n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị.+
8 Ma, e nwere ndị ikom iri n’ime ha ndị gwara Ishmel ozugbo, sị: “Egbula anyị, n’ihi na e nwere nri anyị zoro n’ọhịa, bụ́ ọka wit na ọka bali na mmanụ na mmanụ aṅụ.”+ O wee hapụ ha, o gbukọtaghị ha na ụmụnne ha.