36 “‘Dị nnọọ ka m mere ka mụ na nna nna unu hà baa n’ikpe n’ala ịkpa nke ala Ijipt,+ otú ahụ ka m ga-eme ka mụ na unu baa n’ikpe,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
2 Nụrụnụ okwu ikpe Jehova, unu ugwu niile, nụrụkwanụ, unu ihe ndị na-adịte anya, unu ntọala ụwa;+ n’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu ikpe, ọ bụkwa ya na Izrel ga-arụrịta ụka:+