15 “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe,+ unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ.+ Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.
16 “M wee nye ndị ikpe unu iwu n’oge ahụ, sị, ‘Mgbe unu na-anụrụ okwu ikpe n’etiti ụmụnne unu, kpeenụ ikpe n’ezi omume+ n’etiti mmadụ na nwanne ya ma ọ bụ n’etiti mmadụ na onye mbịarambịa+ ya na ya bi.