18 “Bịanụ ka anyị kpezie,” ka Jehova kwuru.+ “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha;+ ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara dị ka ákwà uhie, ọ ga-adị ka ajị ọcha.
7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
20 kama ebu m ụzọ wetara ndị bi na Damaskọs+ ozi ahụ, wetakwara ndị bi na Jeruselem,+ na n’obodo Judia dum, nakwa ndị mba ọzọ+ ka ha niile chegharịa ma chigharịkwuru Chineke site n’ịrụ ọrụ kwesịrị nchegharị.+