3 Lee ka ihe ịrịba ama ya si dị ukwuu, leekwa ka ihe ebube ọ na-eme si dị ukwuu!+ Alaeze ya bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
7 M ga-emekwa ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+ meekwa ka ndị ahụ a chịgara n’ebe dị anya bụrụ mba dị ike;+ Jehova ga-achịkwa ha dị ka eze n’Ugwu Zayọn, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+