24 Osisi niile dị n’ọhịa ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ emewo ka osisi dị elu dịrị ala,+ mee ka osisi dị ala dịrị elu,+ mee ka osisi dị ndụ kpọnwụọ,+ meekwa ka osisi kpọnwụrụ akpọnwụ too nke ọma. Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, meekwa ya.”’”+
17 Ọ bụ ndị nche+ nyere iwu a; ọ bụkwa ndị nsọ kwuru ka e mee ihe a; ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ,+ ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya,+ ọ na-emekwa ka onye kasị ala n’etiti ụmụ mmadụ na-achị ya.”+
35 A na-ewere ndị niile bi n’ụwa dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ,+ ọ na-emekwa ihe bụ́ uche ya n’etiti ndị bi n’eluigwe na ndị bi n’ụwa.+ Ọ dịghịkwa onye pụrụ igbochi aka ya+ ma ọ bụ onye pụrụ ịsị ya, ‘Gịnị ka ị na-eme?’+