17 Ma ezi Chineke mere ka ụmụaka a, ha anọ, nwee ọgụgụ isi na nghọta n’ihe banyere edemede na amamihe+ niile; Daniel n’onwe ya na-aghọta ụdị ọhụụ ọ bụla na nrọ ọ bụla.+
12 n’ihi na mmụọ pụrụ iche na ihe ọmụma na nghọta e ji akọwa nrọ+ nakwa nke e ji akọwa ilu nakwa nke e ji atọghe ihe mara akpụ dị n’ime ya,+ n’ime Daniel, bụ́ onye eze gụrụ Belteshaza.+ Ka a kpọọ Daniel ka ọ kọọ isi ya.”