33 Ma m ga-achụsasị unu ná mba dị iche iche,+ m ga-amịpụtakwa mma agha n’ọbọ ka ọ chụwa unu;+ ala unu ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu,+ obodo unu dị iche iche ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.
6 N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+
11 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na Jehova ga-esetị aka ya ọzọ, nke ugboro abụọ,+ inweta ndị fọdụrụ n’etiti ndị ya, bụ́ ndị ga-afọdụ site n’Asiria+ na Ijipt+ na Patrọs+ na Kush+ na Ilam+ na Shaịna+ na Hemat nakwa agwaetiti nke oké osimiri.+