26 N’ihi na o nyewo onye bụ́ ezi mmadụ n’ihu ya+ amamihe na ihe ọmụma na aṅụrị,+ ma o nyewo onye mmehie ọrụ ịchịkọta ihe na ikpokọta ihe naanị ka o bunye ha onye bụ́ ezi mmadụ n’ihu ezi Chineke.+ Nke a kwa bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.+
17 ka Chineke nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke ebube, wee nye unu mmụọ nke amamihe,+ ka unu wee ghọta ihe ndị ọ na-ekpughe n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere ya+;
5 Ya mere, ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ,+ ka ọ na-arịọ Chineke,+ n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha;+ ọ ga-enye onye ahụ amamihe.+